1. Lee ntọala d’ike, Ndi nsọ’nk’Onyenw’ayị,
Tọrọ n’okwukw’unu n’okwu ya kasịmma!
Gịnị k’ọg’ekwu ọzọ karịa nk’okwuru,—
Ndị n’ak’Onye nzọpụta, Ndi n’ak’Onye nzọpụta,
Ndin’ak’Ọnye nzopụtagbabaworo?
2. N’im’onọdụ’ọbụlan’ọrịa n’ahụike,
N’ogbenye m’ọbụ n’uju a kụ, n’ụba,
N’ụlọ ma’ọbụ mba, n’elu’ala m’ọbụ osimiri
Dịka ụbọchị gị si chọ, dịka ụbọchị gị si chọọ,
Dịka ụbọchị ka iny’a-ka gị ga’dị.
3. Atụ , l’egwu, m nọ; obi’unu adala’mba.
N’ihi’a bụ’mChigị ma g’enyere gị aka.
M g’agba gị’ume nyere gị’aka k’lguzo,
Jide g’ị n’aka ezi omume m, Jide gị n’aka ezi omume m,
Jide n’aka ezi omume m, pụrụ’im’ihedum.
4. Mgbe’m kpọrọ gị gafe’ Ogbu mmiri nile,
Osimiri mwute agagh’emikpu gị,
N’ihi na’m g’a-nọ, gọzịe, nsogbu gị nile,
Ma sachapụrụ gị, onwe gị, Ma sachapụrụ gị onwe gị
Ma sachapụrụ gị nsogbu gị dị omimi.
5. Mgbe ọnwụnwa nile n’ụzọ gị tọgbọọ,
Amara m zuru, ga-’bụ oke nke gị.
Ire’ọkụ agagh’ere gị; nanị a chọrọ m
K’erechapụ afụrụ gị, k’erechapụ afụrụ gị,
K’erechapụ afụrụ, sacha ọla-edo gị.
6. Ọbụna ruo na nka, ndi m nile g’ezi,
Ịbụ-eze m, ebigh-ebi, ịhụn’anya nke mụ;
Ma mgbe isi’awọ g’achọ isi ha mma,
Dịka nwa-atụrụ, ha ka bụ, Dịka nwa-atụrụ ha ka bụ,
Dịka nwa-atụrụ, ha ka m g’eku n’obi mụ.
7. Mkpụr’obi daber’izuike na Jisus,
Agaghị m, enweghị m ik’ịhara ndi iro;
Obi ahụ, ọkụ mụọ ga-’gbalị ịkwatu,
E-e ọdịghị mgb’ọbụla, E-e ọdịghị mgb’ọbụla,
E-e ọdịghị mgb’ọbụla m ga hapụ ya!
Iso-okwu: Attr. to Robert Keen, ca. 1787. E tinyere n’ime akwụkwọ-abụ mbụ nke LDS, 1835.
Egwu: Attr. to J. Ellis, ca. 1889