Page 14
Gụkọọ Ngọzi Gị Nile
Gụkọọ Ngọzi Gị Nile
1. ’Gb’ebili mmiri’nke ndụ n’efegharị,Mgb’in’eche n’ihe nile efu siwo,Gụk’ọtụtụ ngọzi’ị; gị n’otu n’otu,Ọlụ Chineke lụrụ g’eju g’a nya.
Gụ kọ ngọzi’Ị;Kpọọ ha otun’otu.Gụọ ngọzi gị;Hụ’ọlụ Chineke.Gụọ ngọzi gị;Kpọọ ha’otu n’otu.Gụk’ọtụtụ ngọzi’ị;Hụ’ọlụ Chineke.
2. O, nwere mgb’e boro gị ibu dị arọ?Obe ahụ e boro gị dị k’ọ dị’arọ?Gụk’ọtụtụ ngọzi’ị; Obi’abụọ g’apụ,M’ịga n’an̅ụrị ọn̅ụ k’ụbọchị n’aga.
Gụ kọ ngọzi’Ị;Kpọọ ha otun’otu.Gụọ ngọzi gị;Hụ’ọlụ Chineke.Gụọ ngọzi gị;Kpọọ ha’otu n’otu.Gụk’ọtụtụ ngọzi’ị;Hụ’ọlụ Chineke.
3. Gbe’i’nele ala ndi ọzọ ya n’ọl’edo ha,Cheta Kraịst kwere gị nkwa apụgh’ ịkọ.Gụk’ọtụtụ ngọzi’ị; ego apụgh’ ịzụỤgw’ọlụ ịn’elu igwe n’ụlọ gị, n’e lu.
Gụ kọ ngọzi’Ị;Kpọọ ha otun’otu.Gụọ ngọzi gị;Hụ’ọlụ Chineke.Gụọ ngọzi gị;Kpọọ ha’otu n’otu.Gụk’ọtụtụ ngọzi’ị;Hụ’ọlụ Chineke.
4. Otu a n’etiti ogụ’ukwu m’obụ nke ntaEnwela ume ngwụ; Chukwụ ka ịhe dum.Gụk’ọtụtụ ngọzi’ị; ’ndi m ozi g’abịa,i nye aka n’ị kasị’obi ru’ọgwụgwụnjem.
Gụ kọ ngọzi’Ị;Kpọọ ha otun’otu.Gụọ ngọzi gị;Hụ’ọlụ Chineke.Gụọ ngọzi gị;Kpọọ ha’otu n’otu.Gụk’ọtụtụ ngọzi’ị;Hụ’ọlụ Chineke.
Isi-okwu: Johnson Oatman Jr., 1856–1922
Egwu: Edwin O. Excell, 1851–1921