Page 14
Gụkọọ Ngọzi Gị Nile
Gụkọọ Ngọzi Gị Nile
1. ’Gb’ebili mmiri’nke ndụ n’efegharị,
Mgb’in’eche n’ihe nile efu siwo,
Gụk’ọtụtụ ngọzi’ị; gị n’otu n’otu,
Ọlụ Chineke lụrụ g’eju g’a nya.
Gụ kọ ngọzi’Ị;
Kpọọ ha otun’otu.
Gụọ ngọzi gị;
Hụ’ọlụ Chineke.
Gụọ ngọzi gị;
Kpọọ ha’otu n’otu.
Gụk’ọtụtụ ngọzi’ị;
Hụ’ọlụ Chineke.
2. O, nwere mgb’e boro gị ibu dị arọ?
Obe ahụ e boro gị dị k’ọ dị’arọ?
Gụk’ọtụtụ ngọzi’ị; Obi’abụọ g’apụ,
M’ịga n’an̅ụrị ọn̅ụ k’ụbọchị n’aga.
Gụ kọ ngọzi’Ị;
Kpọọ ha otun’otu.
Gụọ ngọzi gị;
Hụ’ọlụ Chineke.
Gụọ ngọzi gị;
Kpọọ ha’otu n’otu.
Gụk’ọtụtụ ngọzi’ị;
Hụ’ọlụ Chineke.
3. Gbe’i’nele ala ndi ọzọ ya n’ọl’edo ha,
Cheta Kraịst kwere gị nkwa apụgh’ ịkọ.
Gụk’ọtụtụ ngọzi’ị; ego apụgh’ ịzụ
Ụgw’ọlụ ịn’elu igwe n’ụlọ gị, n’e lu.
Gụ kọ ngọzi’Ị;
Kpọọ ha otun’otu.
Gụọ ngọzi gị;
Hụ’ọlụ Chineke.
Gụọ ngọzi gị;
Kpọọ ha’otu n’otu.
Gụk’ọtụtụ ngọzi’ị;
Hụ’ọlụ Chineke.
4. Otu a n’etiti ogụ’ukwu m’obụ nke nta
Enwela ume ngwụ; Chukwụ ka ịhe dum.
Gụk’ọtụtụ ngọzi’ị; ’ndi m ozi g’abịa,
i nye aka n’ị kasị’obi ru’ọgwụgwụnjem.
Gụ kọ ngọzi’Ị;
Kpọọ ha otun’otu.
Gụọ ngọzi gị;
Hụ’ọlụ Chineke.
Gụọ ngọzi gị;
Kpọọ ha’otu n’otu.
Gụk’ọtụtụ ngọzi’ị;
Hụ’ọlụ Chineke.
Isi-okwu: Johnson Oatman Jr., 1856–1922
Egwu: Edwin O. Excell, 1851–1921