Page 30
Lee Onye-mgbapụta Ukwu Anwụọ
Lee Onye-mgbapụta Ukwu Anwụọ
1. Lee Onye mgbaput’ukwu anwụọ,
Imez’iwu emebiri.
Ọ nwụrụ aja nke mmehie,
Ọ nwụrụ aja nke mmehie,
Ka mmadụ dị ndụ ma nw’otuto.
2. Ndi ’kpe mara n’akwa y’emo,
Dupu aka ụkwụ n’akụkụ;
Ji’mkparị, ịkw’emo, nlelị,
Ji’mkparị, ikw’emo, nlelị,
Kpube ya okpu ogwu n’isi.
3. O koro n’ooke ihe mgbu,
Ntamu esịghị ya n’ọnụ. I
lụzu ọlụ ya dị’elu,
I luzu ọlụ ya, dị’elu,
O mezuru uche nna ya.
4. Nna wepụrụ’m iko nke a.
Ịchọ m gan̅ụchapụya.
A lụ wo m’ọlụ Ịnyere m,
Alụwom’ọlụ I nyere m;
Nabata mụọ nke m nye onwe gị.
5. Ọ nwụrụ ma n’ih’egwụ ahụ
Anyanwụ zoro n’ihere!
Ala maa jiji ụwa ma ọsụ
Ala maa jiji ụwa ma ọsụ
“Na nzaghachi Chukwu, anwụwọ!”
6. Ọ dị ndụ, Anyị kpọ isi ala
Gburu gburu akara dị nsọ,
N’achọ ka Ndi-nsọ og’ikpe-azụ,
N’achọ ka Ndi-nsọ og’ikpe-azụ,
Mee uche ya dị ndụ ito ya.
Isi-okwu:Eliza R. Snow, 1804–1887
Egwu:George Careless, 1839–1932