Auto-scroll is most reliable with MIDI (computer-generated) audio.
Practice
Loading…
O Chukwu, Nna Nke Ebigh-ebi
1. O Chukwu’ Nna’ nk’ebigh’ebi,Nke bi n’etit’igwe,N’aha Ji sus ayị n’arịọ’ị,K’Igọzie ma sachaa,M’ayị dị ọcha n’ihu gị,Achịcha n’iko mmaịK’anyị nile n’echetaOnyiny’ahụ dị nsọ.
2. O nyiny’ahụ nke dị nsọ,Nke mmadụ n’aghọtaghị,Iji sacha njọ anyịMa rie’ahụ n’ọbara,K‘ayị n’agba’ma’ mgbe nileAhụhụ nk’Ọkpara Ị,Ma nwere Mụọ ya mgbe dumIme’obi’ayị’ dị k’otu.
3. Jisus etere mmanụ,Rịdara si n’eluMa nye’onwe ya ịkw’ụgwọIrite mkpụr’obị’ayịN’enweghị ez’ịma mma,Ka mmadụ wee chọọ yaOnye’nzọt’ekwere nkwaG’e ji ọkụ sachaa.
4. Le amamihe n’enweghị’oke,Atụmatụ’ị dị nsọ,Mere nzọta k’ozu’okeKpuchie’onye nw’ayị’ n’ahụGaaịjena mgbakwasị’ụkwụ’yaN’achọ’ịdị ka mmadụN’ọnọ dụ ya dị elu,Nwụọ, m’ọbụ’ihe dum efuo.
Isi-okwu:William W. Phelps, 1792–1872. E tinyere n’akwụkwọ-abụ nke mbụ nke ndi LDS, 1835.