Page 36
Lee Nnukwu Amamihe na Ịhụn’anya ahụ
Lee Nnukwu Amamihe na Ịhụn’anya ahụ
1. Lee nnukwu amamihe n’ihụnanyaJuru na mbara eluMa zit’Onye’ nzọpụta si n’eluỊtahụhụ gb’ọbara, nwụọ!
2. Ọbara dị’ok’ọnụ k’ọgbaf’ ru n’efu;Ndụ ya k’o nyere n’e fu,Aja n’enweghị ị kpe ọmụma,Ịzọta ụwa n’anwụ’anwụ.
3. N’oke nrub’isi Jisus ritereIhe nrit’ahụ n’otuto:“Uche gị, Chukwu, Obụghị nke’m mee,”Chọrọ ndụ ya n’ụwa mma.
4. O gosiri ụzọ ma dura anyị,Ma kọwa ọnọdụ’ọbụlaN’e gosìhè ndụ n’ụbọchị agwụ agwụEb’ìhu Chineke n’e nwu.
5. Na ncheta nk’anụ ahụ anyawaraAyị n’eri’achịch’anyawara,Ma jiri iko ahụ, gba ’ama ọzọ,Okwukwe’ayị na Kraịst Ony’isi.
6. Lee ịdị ukwu, otuto, izu-ezu,Atụmatụ mgbapụt’ọma,Ez’ikpe, ịhụn’anya, n’eberezu-te’n-kwe-kọ-rị-ta dị nsọ!
Isi-okwu:Eliza R. Snow, 1804–1887
Egwu:Thomas McIntyre, 1833–1914