Page 36
Lee Nnukwu Amamihe na Ịhụn’anya ahụ
Lee Nnukwu Amamihe na Ịhụn’anya ahụ
1. Lee nnukwu amamihe n’ihụnanya
Juru na mbara elu
Ma zit’Onye’ nzọpụta si n’elu
Ịtahụhụ gb’ọbara, nwụọ!
2. Ọbara dị’ok’ọnụ k’ọgbaf’ ru n’efu;
Ndụ ya k’o nyere n’e fu,
Aja n’enweghị ị kpe ọmụma,
Ịzọta ụwa n’anwụ’anwụ.
3. N’oke nrub’isi Jisus ritere
Ihe nrit’ahụ n’otuto:
“Uche gị, Chukwu, Obụghị nke’m mee,”
Chọrọ ndụ ya n’ụwa mma.
4. O gosiri ụzọ ma dura anyị,
Ma kọwa ọnọdụ’ọbụla
N’e gosìhè ndụ n’ụbọchị agwụ agwụ
Eb’ìhu Chineke n’e nwu.
5. Na ncheta nk’anụ ahụ anyawara
Ayị n’eri’achịch’anyawara,
Ma jiri iko ahụ, gba ’ama ọzọ,
Okwukwe’ayị na Kraịst Ony’isi.
6. Lee ịdị ukwu, otuto, izu-ezu,
Atụmatụ mgbapụt’ọma,
Ez’ikpe, ịhụn’anya, n’ebere
zu-te’n-kwe-kọ-rị-ta dị nsọ!
Isi-okwu:Eliza R. Snow, 1804–1887
Egwu:Thomas McIntyre, 1833–1914