1. Mụọ nke Chineke dịka ọkụ n’enwu enwu!
Otut’ụbọch’ịkpeazụ amalitewo’ịbịa;
Ọhụ na ngọzi mgb’ochie n’alọghachi,
Ndi mụ’ọ zi nabịa ileta ụwa.
Ayị g’abụ ayị g’eti na ndi agha nk’elu’igwe,
Hosana, Hosana Chi na Nw’atụrụ!
K’e nye h’otuto n’elu kachasị elu,
Si ugbua ruo ebighebi, Amen na amen!
2. Onye nw’anyị n’agbatị nghọta nke’ndịnsọ,
N’e weghachi ndi ok’ikpe n’ihe nile k’ọdị mbụ.
Amamihe n’ike nke Chukwu n’agbasa;
Ihe kpuchiri ụwa a malite wo ịgbawa.
Ayị g’abụ ayị g’eti na ndi agha nk’elu’igwe,
Hosana, Hosana Chi na Nw’atụrụ!
K’e nye h’otuto n’elu kachasị elu,
Si ugbua ruo ebighebi, Amen na amen!
3. Ayị g’akpọbat’ezi’ọgbakọ nile n’ime mụọ,
Igbasa al’eze nk’igwe na ebe nile,
Site n’okwukwe k’anyị g’amalit’inwe ta
Ọhụ na ngọzi na otuto nke Chukwu.
Ayị g’abụ ayị g’eti na ndi agha nk’elu’igwe,
Hosana, Hosana Chi na Nw’atụrụ!
K’e nye h’otuto n’elu kachasị elu,
Si ugbua ruo ebighebi, Amen na amen!
4. Ụbọchị dị ngozi mgbe nw’atụrụ na ọdụm
G’e dinakọta n’otu n’enwe gh’i we’ ọbụla
Kpub’Ifrem okpu eze nke ngọzi na Zaịọn,
Ka Jisus n’arịdata n’ụgb’ala nke ọkụ!
Ayị g’abụ ayị g’eti na ndi agha nk’elu’igwe,
Hosana, Hosana Chi na Nw’atụrụ!
K’e nye h’otuto n’elu kachasị elu,
Si ugbua ruo ebighebi, Amen na amen!
Isiokwu:William W. Phelps, 1792–1872. Etinyere n’akwụkwọabụ mbụ nke ndi LDS hymnbook, 1835. A bụrụ n’itinye Temple nke Kirtland n’aka Chineke n’afọ 1836.
Egwu:Anon., ca. 1844