Page 78
Chukwu Nọnyere Gị Ruo Mgbe Anyị Ga-ezu Ọzọ

1. Chukwu nọnyere’Ị ruo’mgb’ayị g’ezu;Ndụmọdụ ya n’edu gị;Chekwa gị n’ụmụ atụrụya.Chukwu nọnyere’Ị ruo’mgb’ayị g’ezu.
Ruo mgbe ayị g’ezu, ruo mgbe’ayị g’ezu,Ruo mgbe ayị g’ezu n’ụkwụ Jisus,Ruo mgbe ayị g’ezu, Ruo mgb’ayị g’ezu,Chukwu nọnyere ị ruo mgb’ayị’ g’ezu.
2. Chukwu nọnyere’I ruo’mgb’ayị’ g’ezu;Mgbe ih’egwu bịara gị,Kukụọ gị’aka n’apụgh’ịda.Chukwu nọnyere’Ị ruo’mgb’ayị g’ezu.
Ruo mgbe ayị g’ezu, ruo mgbe’ayị g’ezu,Ruo mgbe ayị g’ezu n’ụkwụ Jisus,Ruo mgbe ayị g’ezu, Ruo mgb’ayị g’ezu,Chukwu nọnyere ị ruo mgb’ayị’ g’ezu.
3. Chukwu nọnyere’Ị ruo’mgb’ayị’ g’ezu;Debe gị n’ịhụn’anya ya;Tituo’mmaj’ọnwụ n’ihu gị.Chukwu nọnyere’Ị ruo’mgb’ayị g’ezu.
Ruo mgbe ayị g’ezu, ruo mgbe’ayị g’ezu,Ruo mgbe ayị g’ezu n’ụkwụ Jisus,Ruo mgbe ayị g’ezu, Ruo mgb’ayị g’ezu,Chukwu nọnyere ị ruo mgb’ayị’ g’ezu.
Isiokwu:Jeremiah E. Rankin, 1828–1904
Egwu:William G. Tomer, 1833–1896