Page 78
Chukwu Nọnyere Gị Ruo Mgbe Anyị Ga-ezu Ọzọ
Chukwu Nọnyere Gị Ruo Mgbe Anyị Ga-ezu Ọzọ
1. Chukwu nọnyere’Ị ruo’mgb’ayị g’ezu;
Ndụmọdụ ya n’edu gị;
Chekwa gị n’ụmụ atụrụya.
Chukwu nọnyere’Ị ruo’mgb’ayị g’ezu.
Ruo mgbe ayị g’ezu, ruo mgbe’ayị g’ezu,
Ruo mgbe ayị g’ezu n’ụkwụ Jisus,
Ruo mgbe ayị g’ezu, Ruo mgb’ayị g’ezu,
Chukwu nọnyere ị ruo mgb’ayị’ g’ezu.
2. Chukwu nọnyere’I ruo’mgb’ayị’ g’ezu;
Mgbe ih’egwu bịara gị,
Kukụọ gị’aka n’apụgh’ịda.
Chukwu nọnyere’Ị ruo’mgb’ayị g’ezu.
Ruo mgbe ayị g’ezu, ruo mgbe’ayị g’ezu,
Ruo mgbe ayị g’ezu n’ụkwụ Jisus,
Ruo mgbe ayị g’ezu, Ruo mgb’ayị g’ezu,
Chukwu nọnyere ị ruo mgb’ayị’ g’ezu.
3. Chukwu nọnyere’Ị ruo’mgb’ayị’ g’ezu;
Debe gị n’ịhụn’anya ya;
Tituo’mmaj’ọnwụ n’ihu gị.
Chukwu nọnyere’Ị ruo’mgb’ayị g’ezu.
Ruo mgbe ayị g’ezu, ruo mgbe’ayị g’ezu,
Ruo mgbe ayị g’ezu n’ụkwụ Jisus,
Ruo mgbe ayị g’ezu, Ruo mgb’ayị g’ezu,
Chukwu nọnyere ị ruo mgb’ayị’ g’ezu.
Isiokwu:Jeremiah E. Rankin, 1828–1904
Egwu:William G. Tomer, 1833–1896