Page 90
M Ga-aga Ebe Ị Chọrọ Ka M Gaa
M Ga-aga Ebe Ị Chọrọ Ka M Gaa
1. Ọgaghị’abụ n’el’ugwu ukwu
M’ọbụ n’ebili’ mmiri,
O nwer’ike ọbụghịn’agha
Onyenwe m g’achọ mụ.
M’O jiri olu’nta dịnwayọ kpọọ
N’ụzọ ndi’ nke m n’amaghị,
M g’aza Onyenwe m’akam na nke gị:
M g’ag’ebe’Ị chọrọ ka’m gaa.
M gag’ebe Ị chọrọ ka m ga Onyenwe’m,
N’ugwu, na ndịda na mmiri;
M kwuo ihe’ị chọrọ ka m kwu ezi’Onyenwe m;
M gabụ ịhe ị chọrọ k’am bụ.
2. Ikekwe taa enwer’okw’ụtọ
Nke Jisus g’achọ ka’m kwuo;
Onye kpafuru n’ụzọ mmehie
Onye m’kwesịrị ịchọ.
Onye Nzọpụta bụrụ Onye ndu’m,
N’ụzọ ọchịchị dị’ nkuko
Olu’m ga en̅omi ozi’ụtọ’ahụ:
M g’ekwu ihe’Ịchọrọ ka’m kwuo.
M gag’ebe Ị chọrọ ka m ga Onyenwe’m,
N’ugwu, na ndịda na mmiri;
M kwuo ihe’ị chọrọ ka m kwu ezi’Onyenwe m;
M gabụ ịhe ị chọrọ k’am bụ.
3. Onwer’ebe dị ala n’ezie
N’ubi ụwa sar’asa
Ebe’m g’alụ ọlụ ndụ mkpụ mkpụ
Maka Jisus a kpọgb’ru.
N’inye ihe’m nile n’aka ebere gị,
N’ịmata n’ịhụrụ m n’anya,
M’ g’eji obi ọcha mee uche gị:
M g’abụ’ihe’ịchọrọ ka’m bụ.
M gag’ebe Ị chọrọ ka m ga Onyenwe’m,
N’ugwu, na ndịda na mmiri;
M kwuo ihe’ị chọrọ ka m kwu ezi’Onyenwe m;
M gabụ ịhe ị chọrọ k’am bụ.
Isiokwu:Mary Brown, 1856–1918
Egwu:Carrie E. Rounsefell, 1861–1930