Page 102
Anya, Ezi Anya n’Ala nile nke Judea
Anya, Ezi Anya n’Ala nile nke Judea
1. N’ebe dị’anya n’ala nke Judea,
Ndi’ọzụ’atụrụ’ochie nụrụ ozi’an̅ụrụ:
Too Chineke,
Too Chineke,
Too Chineke n’elu kasị’elu;
Ụdo, dịrị el’ụwa
Afọma dịrị mmadụ!
2. Abụ’mgbapụta’ịhụnanya dị’ụtọ,
Ozi’nk’ebere si n’elu igwe:
Too Chineke,
Too Chineke,
Too Chineke n’elu kasị’elu;
Ụdo, dịrị el’ụwa
Afọma dịrị mmadụ!
3. Onyenw’ayị, ayị na’ndi mụọzi g’an̅ụ;
Nyer’ayị aka iji obi n’olu bụ’abụ:
Too Chineke,
Too Chineke,
Too Chineke n’elu kasị’elu;
Ụdo, dịrị el’ụwa
Afọma dịrị mmadụ!
4. Mee k’oge bịa’ngwa sin’ebo nile,
Ndi’mmadụ g’ejikọ bụọ abụ dị’elu:
Too Chineke,
Too Chineke,
Too Chineke n’elu kasị’elu;
Ụdo, dịrị el’ụwa
Afọma dịrị mmadụ!
Isiokwu na egwu:John Menzies Macfarlane, 1833–1892