Page 116
Ana M Eche Mgbe M Na-agụ Akụkọ Ụtọ Ahụ
Ana M Eche Mgbe M Na-agụ Akụkọ Ụtọ Ahụ
1. M n’eche mgbe m n’agụ akụk’ụt’ochie a,Mgbe Jisus naụm’ụwa nọ,Otu’Ọ kpọbatar’ụmụnta k’atụrụ ya;Ọnadị m k’asị mụ na ya nọ.
2. Ọ dị m k’ọ tụkwasịrị m aka n’isi,N’ọkụkụrụ m aka ya abụọ,N’agara’m ahụ’obi’ọma ya mgbe ọsịrị;“Kwe ka ndi ntakịrị bịakwute m.”
Isi-okwu:Jemima Luke, 1813–1906
Egwu:Leah Ashton Lloyd, 1894–1965