Page 22
Mkpa Gị Na-akpa M Mgbe Dum
Mkpa Gị Na-akpa M Mgbe Dum
1. Mkpa ị n’akpa’ m’gbe dum,
Onye kasị’amara.
Ọdịghị olụ ka nkeỊ
Nwer’ike’inye udo
Mkpa ị n’akpa m, o n’a-kpa m;
Ọ n’akpa’ m’gbe nile!
O, gọzie m Onye nzọta m;
Abịakwute m gị!
2. Mkpa ị n’akpa’ m’gbe dum,
N’anọdụ na nso.
Ike’ọnwụnwa adaa
Mgbe Ị nọ na’ nso.
Mkpa ị n’akpa m, o n’a-kpa m;
Ọ n’akpa’ m’gbe nile!
O, gọzie m Onye nzọta m;
Abịakwute m gị!
3. Mkpa ị n’akpa’ m’gbe dum,
N’an̅ụrị m’ọbụ mgbu.
Bịa’ngwa’ngwa nọnyere m,
M’ọbụ ndụ bụ, n’efu.
Mkpa ị n’akpa’ m’gbe dum,
Onyekachasị nsọ.
O, mee m nke gị n’ezie,
Ọkpara dị’ngọzi!
4. Mkpa ị n’akpa’ m’gbe dum,
Onyekachasị nsọ.
O, mee m nke gị n’ezie,
Ọkpara dị’ngọzi!
Mkpa ị n’akpa m, o n’a-kpa m;
Ọ n’akpa’ m’gbe nile!
O, gọzie m Onye nzọta m;
Abịakwute m gị!
Isi-okwu:Annie S. Hawks, 1835–1918
Egwu:Robert Lowry, 1826–1899